23 n’ihi na ha mere ihe nzuzu n’Izrel,+ ha na nwunye ndị enyi ha na-akwakwa iko,+ ha na-ekwu okwu ụgha n’aha m, bụ́ nke m na-enyeghị ha iwu ka ha kwuo.+
“‘“Mụ onwe m maara, abụkwa m onye akaebe,”+ ka Jehova kwuru.’”
37 N’ihi na ha akwawo iko,+ ọbara dịkwa n’aka ha,+ ha na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị akwawo iko.+ E wezụga nke ahụ, ha ewerewo ụmụ ha mụụrụ m sureere* arụsị ndị a n’ọkụ ka ha bụrụ nri ha.+