28 Ya mere, eze natara ndụmọdụ+ wee mee nwa ehi ọlaedo abụọ+ ma gwa ndị ahụ, sị: “Ọ bụ ihe siri ike nke ukwuu unu ịgbagowe Jeruselem. Lee Chineke gị,+ Izrel, nke kpọpụtara gị n’ala Ijipt.”+
15 Izrel, ọ bụ ezie na ị na-akwa iko,+ ka Juda bụrụ onye ikpe na-amaghị,+ unu abịakwala na Gilgal,+ unu agbagokwala Bet-even,+ unu aṅụkwala iyi, sị, ‘Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ!’+
14 ‘N’ihi na n’ụbọchị m ga-eme ka Izrel zaa ajụjụ+ maka inupụrụ ya isi, m ga-emekwa ka ebe ịchụàjà Betel zaa ajụjụ.+ A ga-egbujipụ mpi ebe ịchụàjà, ọ ga-adakwa n’ala.+