28 N’ihi ya, ala ahụ ga-eru uju,+ eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.+ Ọ bụ n’ihi na ekwuwo m ya, echebaworo m ya echiche, enweghịkwa m mwute, agaghịkwa m ala azụ n’ime ya.+
16 Nyenụ Jehova bụ́ Chineke unu otuto,+ tupu ya emee ka ọchịchịrị gbaa,+ tupu unu akpọbie ụkwụ n’ugwu mgbe chi jiri.+ Unu ga na-ele anya ìhè,+ ma ọ ga-eme ka oké ọchịchịrị gbaa;+ ọ ga-emekwa ka oké itiri gbachie.+