10 Lọt wee lelie anya hụ Ógbè Jọdan+ dum ruo Zoa.+ Ọ hụrụ na ógbè ahụ dum bụ ebe mmiri na-ede nke ọma dị ka ubi Jehova,+ dị ka ala Ijipt, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra.
3 N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+