10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
20 Ee e; kama ihe m na-ekwu bụ na ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ya ndị mmụọ ọjọọ,+ ọ bụghị Chineke; achọghịkwa m ka unu bụrụ ndị ha na ndị mmụọ ọjọọ+ na-emekọ ihe.