7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
9 onye jidesiri okwu ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi ike n’ihe banyere otú o si eji nkà ezi ihe,+ ka o wee nwee ike iji ozizi na-enye ezi ndụ+ na-adụsi ndị mmadụ ọdụ ike, na-adọkwa ndị na-ekwu okwu nke na-emegide okwu ahụ na-enye ezi ndụ aka ná ntị.+