18 Ma nweenụ obi ụtọ,+ ṅụrịakwanụ ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe m na-eke.+ N’ihi na m na-eke Jeruselem ka ọ bụrụ ihe na-enye ọṅụ, m na-ekekwa ndị ya ka ha bụrụ ihe na-enye obi ụtọ.+
2 Ahụkwara m obodo nsọ ahụ,+ bụ́ Jeruselem Ọhụrụ, ka o si n’eluigwe,+ n’ebe Chineke nọ, na-agbadata. A kwadebekwara ya dị ka nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ nke a chọrọ mma maka di ya.+