10 “Unu bụ ndị àmà m,”+ ka Jehova kwuru, “ọbụna ohu m nke m họọrọ,+ ka unu wee mara,+ nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,+ ka unu wee ghọtakwa na abụ m otu Onye ahụ.+ Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m,+ ọ dịghịkwa nke sochiri m.+
4 Ruo mgbe mmadụ mere agadi, abụ m otu Onye ahụ;+ ruokwa mgbe mmadụ nwere isi awọ́, mụ onwe m ga na-ebu ya.+ Mụ onwe m ga-eme ihe,+ ka mụ onwe m wee na-eku ya, na-ebu ya, meekwara ya ụzọ mgbapụ.+
17 Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+