40 “O mewo ka anya ha kpuo ìsì, o mewokwa ka obi ha kpọọ nkụ,+ ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji obi ha ghọta ihe ma chigharịa, ka m wee gwọọ ha.”+
8 dị nnọọ ka e dere, sị: “Chineke enyewo ha mmụọ nke oké ụra,+ nyekwa ha anya ka ha wee ghara ịhụ ụzọ, nyekwa ha ntị ka ha wee ghara ịnụ ihe, ruo taa.”+
14 Ma e mere ka ike iche echiche ha ghara ịdịkwa nkọ.+ N’ihi na ruo taa, a dịghị ekpupụ otu ákwà mkpuchi ahụ mgbe a na-agụ ọgbụgba ndụ+ ochie ahụ, n’ihi na a na-ewepụ ya site n’aka Kraịst.+