Jenesis 6:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 N’ihi ya, Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche+ mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+ Jenesis 8:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Jehova wee nụ ísì ụtọ,+ Jehova wee sị n’obi ya:+ “Agaghị m akọcha ala ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ọchịchọ+ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa;+ ọ dịghịkwa mgbe m ga-eti ihe niile dị ndụ ihe otiti dị nnọọ ka m mere.+ Abụ Ọma 14:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Onye nzuzu asịwo n’obi ya:“Jehova adịghị.”+Ha emewo omume na-eweta mbibi,+ ha emewo arụ n’omume ha.Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+ Jeremaya 17:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.+ Ònye pụrụ ịmara ya?
5 N’ihi ya, Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa nakwa na ihe niile obi ya na-eche+ mgbe niile bụ naanị ihe ọjọọ.+
21 Jehova wee nụ ísì ụtọ,+ Jehova wee sị n’obi ya:+ “Agaghị m akọcha ala ọzọ+ n’ihi mmadụ, n’ihi na ọchịchọ+ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa;+ ọ dịghịkwa mgbe m ga-eti ihe niile dị ndụ ihe otiti dị nnọọ ka m mere.+
14 Onye nzuzu asịwo n’obi ya:“Jehova adịghị.”+Ha emewo omume na-eweta mbibi,+ ha emewo arụ n’omume ha.Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+