18 Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nụkwara ya, ha wee malite ịchọ otú ha ga-esi gbuo ya;+ n’ihi na ha na-atụ ya egwu, n’ihi na otú o si ezi ihe nọ na-eju ìgwè mmadụ ahụ dum anya.+
20 Jizọs zara ya, sị: “Agwara m ụwa okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ,+ bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọta; ọ dịghịkwa ihe m kwuru na nzuzo.