33 “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke, bụ́ onyeisi ezinụlọ,+ onye kọrọ ubi vaịn, gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe nzọchapụta mmanya na ya, wuokwa ụlọ elu,+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+
12Ọ malitekwara iji ihe atụ na-agwa ha okwu, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaakwa ya ogige gburugburu, ma gwuo olulu nke mmanya si n’ebe nzọchapụta mmanya ga na-agbanye, wuokwa ụlọ elu,+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi,+ wee gawa mba ọzọ.+