14 Mkpụrụ gị ga-adịkwa ka ájá dị n’ala,+ ị ga-agbasakwa ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’ebe ugwu ma ruo n’ebe ndịda,+ ọ bụkwa site na gị nakwa site ná mkpụrụ gị ka ezinụlọ niile nke ala ga-agọzi onwe ha.+
19 Malite n’ebe ọdịda anyanwụ, a ga-ebido ịtụ egwu aha Jehova,+ malitekwa n’ebe ọwụwa anyanwụ, a ga-ebido ịtụ egwu ebube ya,+ n’ihi na ọ ga-abata dị ka osimiri nke na-akpata nsogbu, nke mmụọ Jehova mere ka ọ na-asọ asọ.+