6 Ma mgbe Pọl matara na otu akụkụ bụ ndị Sadusii,+ akụkụ nke ọzọ abụrụ ndị Farisii, o tiri mkpu n’ime Sanhedrin, sị: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii,+ nwa onye Farisii. Ọ bụ n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ+ nke ndị nwụrụ anwụ ka a na-ekpe m ikpe.”+
5 e biri m úgwù n’ụbọchị nke asatọ,+ esi m n’ezinụlọ Izrel, n’ebo Benjamin,+ abụ m onye Hibru nke ndị Hibru mụrụ;+ n’ihe banyere iwu, abụ m onye Farisii;+