10 Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya.
44 O wee sị ha: “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma+ na Abụ Ọma+ banyere m aghaghị imezu.”