9 Ya mere, nwaanyị Sameria ahụ sịrị ya: “N’agbanyeghị na ị bụ onye Juu, olee otú i si na-arịọ m ka m nye gị mmiri ka ị ṅụọ, ebe m bụ nwaanyị Sameria?” (N’ihi na ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.)+
28 Ha wee duru Jizọs si n’ụlọ Keyafas gaa n’obí gọvanọ.+ Ọ bụzi ụtụtụ. Ma ha onwe ha abanyeghị n’obí gọvanọ ahụ, ka ha wee ghara ịbụ ndị e merụrụ,+ kama ka ha nwee ike iri nri ememme ngabiga.