11 N’ihi na ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe onye dara ogbenye n’ala gị.+ Ọ bụ ya mere m ji na-enye gị iwu, sị, ‘Mesapụrụ nwanne gị aka, bụ́ onye nọ n’ahụhụ, nke dakwara ogbenye n’ala gị.’+
2 na n’oge ha nọ ná mmekpa ahụ́ n’ihi oké ule ha nọ na ya, ọṅụ dị ukwuu ha nwere kpaliri ha igosi na ha bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ+ site n’oké mmesapụ aka ha, n’agbanyeghị na ha dara ogbenye nke ukwuu.