30 Ndị ahụ o kpebiri tupu oge eruo+ bụkwa ndị ọ kpọrọ;+ ndị ahụ ọ kpọrọ bụkwa ndị ọ kpọrọ ndị ezi omume.+ N’ikpeazụ, ndị ahụ ọ kpọrọ ndị ezi omume bụ ndị o mekwara ka ha dị ebube.+
12 N’ihi na ka ọ dị ugbu a, anyị ji enyo ígwè+ na-ahụ ihe inyoghi inyoghị, ma mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihu na ihu.+ Ka ọ dị ugbu a, m maara ihe n’ụzọ na-ezughị ezu, ma mgbe ahụ, m ga-amara ihe n’ụzọ ziri ezi ọbụna dị ka a maara m n’ụzọ ziri ezi.+
2 Ndị m hụrụ n’anya, ugbu a, anyị bụ ụmụ Chineke,+ ma e mebeghị ka ihe anyị ga-abụ pụta ìhè.+ Anyị maara na mgbe ọ bụla e mere ka onye ahụ pụta ìhè,+ anyị ga-adị ka ya,+ n’ihi na anyị ga-ahụ ya otú ọ dị.+