19 N’ihi na m kwara ụta mgbe m lọghachiri;+ mgbe e mere ka m mara ihe, m tiri aka n’apata ụkwụ m.+ Ihere wee jide m, m wee bụrụ onye e mechuru ihu,+ n’ihi na eburuwo m nkọcha n’ihi ihe m mere n’oge m bụ okorobịa.’”+
20 kama ebu m ụzọ wetara ndị bi na Damaskọs+ ozi ahụ, wetakwara ndị bi na Jeruselem,+ na n’obodo Judia dum, nakwa ndị mba ọzọ+ ka ha niile chegharịa ma chigharịkwuru Chineke site n’ịrụ ọrụ kwesịrị nchegharị.+