14 N’ihi na ọ bụrụ na okwukwe anyị bụ na Jizọs nwụrụ, sikwa n’ọnwụ bilie,+ otú ahụkwa, Chineke ga-akpọlite ndị dara n’ụra ọnwụ n’ime Jizọs ka ha soro Jizọs.+
8 Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume,+ nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume,+ ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ+ n’ụbọchị ahụ,+ ma ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.
13 M wee nụ olu nke si n’eluigwe sị: “Dee, sị: Obi ụtọ na-adịrị ndị nwụrụ anwụ,+ bụ́ ndị na-anwụ n’ime Onyenwe anyị+ site ugbu a gaa n’ihu.+ Ee, ka mmụọ nsọ na-ekwu, ka ha zuru ike ná ndọgbu ha dọgburu onwe ha n’ọrụ, n’ihi na ihe ha mere na-eso ha aga.”