2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.
22 Ònye bụ onye ụgha ma ọ bụghị onye na-asị na Jizọs abụghị Kraịst?+ Ọ bụ onye a bụ onye na-emegide Kraịst,+ ya bụ, onye na-agọnahụ Nna ahụ na Ọkpara ya.+