24 N’ihi na Kraịst ụgha+ na ndị amụma ụgha+ ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama+ na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+
3 Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ọ gaghị abịa ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nwee ndapụ n’ezi ofufe,+ e kpugheekwa+ onye ahụ na-emebi iwu,+ nke bụ́ nwa mbibi.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.