-
Jenesis 41:5-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ụra buuru Fero ọzọ, o wee rọọ nrọ ọzọ. Ná nrọ a, ọ hụrụ oko ọka* asaa mịrị n’otu okporo ọka. Ọka ndị ahụ juru eju, maakwa mma n’anya.+ 6 Ọ hụkwara oko ọka asaa ọzọ ndị mịrị mgbe ndị nke mbụ ahụ mịchara. Ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ, ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mekwara ka ha kpọọ nkụ. 7 Oko ọka ndị ahụ fịkpọrọ afịkpọ malitekwara ilo oko ọka asaa ahụ juru eju ma mma mma n’anya. Fero wee teta n’ụra ma ghọta na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.
-