16 N’ihi na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile dị ma n’eluigwe ma n’ụwa, ihe ndị e nwere ike ịhụ anya na ihe ndị a na-enweghị ike ịhụ anya,+ ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ndị isi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike. E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile,+ e kekwara ha maka ya.