44 Unu si ná nna unu bụ́ Ekwensu, unu na-achọkwa ime ihe nna unu chọrọ.+ Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere,+ o guzosighịkwa ike n’eziokwu n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ na-agha ụgha, ọ na-ekwu ihe bụ́ uche ya, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.+