34 Mgbe Ịsọ dị afọ iri anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiraị onye Het, lụọkwa Basemat nwa Ịlọn onye Het.+35 Ihe ụmụ nwaanyị a na-eme nọ na-agbawa Aịzik na Ribeka obi.+
46 Mgbe e mechara, Ribeka nọ na-agwa Aịzik, sị: “Ụmụ nwaanyị Het a emeela ka ike ndụ gwụ m.+ Ọ bụrụ na Jekọb anwaa anwaa lụta otu n’ime ụmụ nwaanyị Het, dị ka ụmụ nwaanyị a bụ́ ndị obodo a, olee uru ndụ m baara m?”+