3 Jekọb sịrị Josef:
“Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile pụtara n’ihu m na Lọz nke dị na Kenan ma gọzie m.+ 4 Ọ sịrị m, ‘M ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ ma baa ụba. M ga-eme ka ị ghọọ nnukwu mba,+ m ga-enyekwa ụmụ gị ala a ka ọ bụrụ nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’+