5 Aha gị agaghịzi abụ Ebram.* Aha gị ga-abụzi Ebreham,* n’ihi na m ga-eme ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba. 6 M ga-eme ka ị mụọ nnọọ ọtụtụ ụmụ, meekwa ka ị bụrụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esikwa n’agbụrụ gị.+
13 Ha wee chịrị igu nkwụ gawa izute ya. Ha malitekwara iti mkpu, sị: “Biko, zọpụta ya! Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova*+ bụ onye a gọziri agọzi. Ọ bụ Eze Izrel!”+