-
Ọpụpụ 25:10-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 “Ha ga-eji osisi akeshịa rụọ igbe nke ga-adị kubit* abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 11 Ị ga-ejizi ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ Ị ga-amachi ya ime na azụ, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+ 12 Ị ga-eji ọlaedo kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị na ya ma kwụnye ha n’elu ebe ụkwụ ya anọ ga-adị. Abụọ ga-adị n’otu akụkụ ya, abụọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 13 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi abụọ ma jiri ọlaedo machie ha.+ 14 Ị ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’akụkụ Igbe ahụ, ka e jiri ha na-ebu Igbe ahụ. 15 Okporo osisi ndị ahụ ga na-adị n’ihe ndị ahụ dị okirikiri a kwụnyere n’Igbe ahụ. A gaghị na-ewepụ ha ewepụ na ha.+
-