-
Ọpụpụ 25:17-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ okwuchi ya, nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo nakwa otu kubit na ọkara n’obosara.+ 18 Ị ga-eji ọlaedo rụọ cherob abụọ. Ị ga-eji hama kụọ ha. Ha ga-adị na nsọtụ abụọ nke okwuchi igbe ahụ.+ 19 Rụọ cherob ndị ahụ ka otu dịrị n’otu nsọtụ, otu adịrị na nsọtụ nke ọzọ n’elu okwuchi igbe ahụ. 20 Cherob ndị ahụ ga-achịli nku ha abụọ elu, sachie okwuchi igbe ahụ,+ ha ga-echekwa ibe ha ihu. Ihu cherob ndị ahụ ga-ekpudo n’okwuchi igbe ahụ.
-