-
Ọpụpụ 25:31-39Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 “Ị ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji adọsa ọkụ.*+ Ị ga-eji hama kụọ ihe a e ji adọsa ọkụ. Ọ ga-enwe ụkwụ n’ala ala ya, nwee okporo, alaka, iko, isi, na ifuru. Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 32 Ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* ga-enwe alaka isii n’akụkụ ya abụọ, alaka atọ ga-adị n’otu akụkụ ya, alaka atọ adịrị n’akụkụ ya nke ọzọ. 33 Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adị n’alaka nke ọ bụla dị n’otu akụkụ, otu isi na otu ifuru adịrị n’agbata otu iko na iko ibe ya. Iko atọ ndị yiri okooko almọnd ga-adịkwa n’alaka nke ọ bụla dị n’akụkụ ya nke ọzọ, otu isi na otu ifuru adịrịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. Ọ bụ otú a ka a ga-esi rụọ alaka isii ahụ ka ha si n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* pụta. 34 A ga-enwe iko anọ yiri okooko almọnd n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ,* otu isi na otu ifuru ga-adịkwa n’agbata otu iko na iko ibe ya. 35 Otu isi ga-adị n’okpuru alaka abụọ mbụ ga-esi n’okporo ahụ apụta, otu isi ga-adịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, otu isi adịrịkwa n’okpuru alaka abụọ ọzọ na-eso ha, ya bụ, alaka isii ndị ga-esi n’okporo ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* apụta. 36 Ọ bụ otu ọlaedo a na-agwaghị agwa ka a ga-eji rụọ isi ya niile na alaka ya niile na ihe niile ga-adị n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ.* Ha niile ga-abụ otu ihe e ji hama kụọ.+ 37 Ị ga-arụrụ ya ọkụ* asaa. A mụnye ha ọkụ, ha ga na-enye ìhè n’ihu ebe a dọsara ya.+ 38 A ga-eji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ mkpà ndị e ji ejide owu na ihe ndị a ga-eji na-agụnye owu a mụrụ amụ.+ 39 A ga-eji otu talent* ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe ahụ e ji adọsa ọkụ* na arịa ndị a niile.
-