-
Ọpụpụ 27:1-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 “Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ ebe ịchụàjà.+ Ọ ga-adị kubit* ise n’ogologo na kubit ise n’obosara. Ebe ịchụàjà ahụ ga-enwe akụkụ anọ há nhata, ọ ga-adịkwa kubit atọ n’ịdị elu.+ 2 Ị ga-arụnye mpi+ n’akụkụ ya anọ. Ị ga-arụkọta mpi ndị ahụ na ebe ịchụàjà ahụ ka ha bụrụ otu, ị ga-ejikwa ọla kọpa machie ebe ịchụàjà ahụ.+ 3 Ị ga-arụ bọket a ga-eji na-ekpopụ ntụ ya,* rụọkwa shọvel, efere, ndụdụ, na ihe ndị e ji agụnye ọkụ. Ị ga-ejikwa ọla kọpa rụọ arịa ya niile.+ 4 Ị ga-eji ọla kọpa kpaa ihe a ga-etinye n’ime ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa kpụọ ihe anọ dị okirikiri ga-adị n’elu ihe ahụ a kpara akpa, n’akụkụ ya anọ. 5 Ị ga-etinye ihe ahụ a kpara akpa n’okpuru ọnụ ebe ịchụàjà ahụ. Ọ ga-adị n’ime ebe ịchụàjà ahụ, n’ebe etiti ya. 6 Ị ga-eji osisi akeshịa rụọ okporo osisi maka ebe ịchụàjà ahụ, jirikwa ọla kọpa machie ha. 7 A ga-etinye okporo osisi ndị ahụ n’ihe ndị ahụ dị okirikiri, ka okporo osisi ndị ahụ wee dịrị n’akụkụ abụọ nke ebe ịchụàjà ahụ mgbe a na-ebu ya.+ 8 Ị ga-arụ ebe ịchụàjà ahụ ka ọ dị ka igbe osisi nwere oghere. Ị ga-arụ ya ka ọ dị nnọọ otú m gosiri gị n’ugwu.+
-