-
Ọpụpụ 27:9-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 “Ị ga-agba ụlọikwuu ahụ ogige.+ N’akụkụ chere ihu n’ebe ndịda, ogige ya ga-enwe ákwà mgbochi ndị e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa. Otu akụkụ ya ga-adị otu narị (100) kubit n’ogologo.+ 10 Ọ ga-enwe ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere ndị e ji ọla kọpa rụọ. Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha. 11 Ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ugwu ya ga-adịkwa otu narị (100) kubit n’ogologo. Ọ ga-enwekwa ogidi iri abụọ na ntọala iri abụọ nwere oghere e ji ọla kọpa rụọ na ihe ndị e ji ekonye ihe n’ogidi ndị ahụ nakwa ihe ndị e ji ejikọ ihe* na ha, bụ́ ndị e jicha ọlaọcha rụọ. 12 A ga-enwe ákwà mgbochi ndị ga-adị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ ogige ahụ. Ha ga-adị kubit iri ise n’obosara, nweekwa ogidi iri na ntọala iri ndị nwere oghere. 13 Akụkụ ogige ahụ nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-adị kubit iri ise n’obosara. 14 A ga-enwe ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’otu akụkụ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.+ 15 A ga-enwekwa ákwà mgbochi ndị dị kubit iri na ise n’akụkụ ya nke ọzọ nakwa ogidi atọ na ntọala atọ ndị nwere oghere.
-