6 Ahọpụtakwala m Oholiab,+ nwa Ahisamak, onye ebo Dan ka o nyere ya aka. M ga-emekwa ka ndị niile nwere nkà* nwee amamihe, ka ha wee rụọ ihe niile m nyere gị n’iwu:+
2 Mosis wee kpọọ Bezalel na Oholiab na nwoke ọ bụla nwere nkà, bụ́ onye Jehova mere ka o nwee amamihe,+ onye ọ bụla o metụrụ n’obi iwepụta onwe ya ịrụ ọrụ ahụ.+