-
Ọpụpụ 26:19-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 “Ị ga-eji ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ndị nwere oghere+ a ga-akwụnye frem iri abụọ ahụ na ha. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, bụ́ ebe ụkwụ ya abụọ ga-abanye. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adịcha n’okpuru frem ndị ọzọ, bụ́ ebe ụkwụ ha abụọ abụọ ga-abanye.+ 20 Ị ga-arụ frem iri abụọ ndị ga-adị n’akụkụ nke ọzọ nke ụlọikwuu ahụ, n’ebe ugwu, 21 jirikwa ọlaọcha rụọ ntọala iri anọ ha ndị nwere oghere. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.
-
-
Ọpụpụ 26:25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 A ga-enwe frem asatọ nakwa ntọala iri na isii ha nwere oghere bụ́ ndị e ji ọlaọcha rụọ. Ntọala abụọ nwere oghere ga-adị n’okpuru otu frem, ntọala abụọ nwere oghere adịrịchaa n’okpuru frem ndị ọzọ.
-
-
Ọpụpụ 26:32Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Ị ga-ekonye ya n’ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo machie. A ga-eji ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. A ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ntọala anọ nwere oghere ndị e ji ọlaọcha rụọ.
-