-
Ọpụpụ 28:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 “Ọ bụ uwe ndị a ka ha ga-akpa: akpa a na-anya n’obi,+ efọd,+ uwe na-enweghị aka,+ uwe mwụda a kpara n’ụdị pụrụ iche,* ákwà isi,+ na ákwà a na-eke n’úkwù.+ Ha ga-akpara Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe nsọ ndị a, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m. 5 Ndị ọrụ nwere nkà ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin kpaa ha.
-