-
Ọrụ Ndịozi 7:30-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
30 “Mgbe afọ iri anọ gachara, otu mmụọ ozi pụtara n’ihu ya n’ọkụ na-enwu n’otu osisi ogwu, n’ala ịkpa dị n’Ugwu Saịnaị.+ 31 Mgbe Mosis hụrụ ihe a, ọ tụrụ ya n’anya. Ma ka ọ na-eru nso ka ọ chọpụta ihe na-eme, ọ nụrụ olu Jehova* ka ọ sịrị: 32 ‘Abụ m Chineke nna nna gị hà, Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb.’+ Mosis wee bido ịma jijiji. Ụjọ ekweghịzi ya ile osisi ahụ anya. 33 Jehova* wee sị ya: ‘Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ. 34 Ahụla m ahụhụ a na-ata ndị m nọ n’Ijipt, anụkwala m ude ha na-asụ.+ Agbadatala m ka m napụta ha. Ugbu a, bịa ka m ziga gị Ijipt.’
-