Diuterọnọmi 31:23 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 23 O* meziri Joshụa nwa Nọn onye ndú,+ wee sị ya: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị Izrel n’ala ahụ m ṅụụrụ ha iyi na m ga-enye ha,+ m ga-anọnyekwara gị.” Joshụa 1:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Ị ga-emeri ndị niile ga-alụso gị agha n’oge niile ị dị ndụ.+ M ga-anọnyere gị+ otú m nọnyeere Mosis. Agaghị m ahapụ gị, agaghịkwa m agbakụta gị azụ.+ Aịzaya 41:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+ Ndị Filipaị 4:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.+
23 O* meziri Joshụa nwa Nọn onye ndú,+ wee sị ya: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị Izrel n’ala ahụ m ṅụụrụ ha iyi na m ga-enye ha,+ m ga-anọnyekwara gị.”
5 Ị ga-emeri ndị niile ga-alụso gị agha n’oge niile ị dị ndụ.+ M ga-anọnyere gị+ otú m nọnyeere Mosis. Agaghị m ahapụ gị, agaghịkwa m agbakụta gị azụ.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’