17Mgbe Ebram dị afọ iri itoolu na itoolu, Jehova pụtara n’ihu Ebram, sị ya: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Mewe ihe dị m mma,* bụrụkwa onye a na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.
7 “M ga-emezu ọgbụgba ndụ mụ na gị+ na nke mụ na ụmụ* gị n’ọgbọ ha niile. Ọ bụ ọgbụgba ndụ ga-adịru ebighị ebi, nke m ji ekwe gị nkwa na m ga-abụ Chineke gị nakwa Chineke ụmụ* gị.