-
Levitikọs 22:18-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile okwu, sị ha, ‘Mgbe onye Izrel ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa bi n’Izrel na-ewetara Jehova àjà a na-esu ọkụ+ ka o jiri ya mezuo nkwa o kwere ma ọ bụ ka ọ bụrụ onyinye si ya n’obi ọ na-enye Chineke,+ 19 ọ ga-esi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ụmụ ebule ma ọ bụ n’ìgwè ewu weta oké nke ahụ́ dị mma,+ ka e wee nabata onyinye ya. 20 Unu ewetala ihe ọ bụla nwere nkwarụ+ n’ihi na ọ ga-eme ka Chineke ghara ịnabata unu.
-