-
Levitikọs 4:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 “‘Ọ ga-ewepụta abụba niile dị n’oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie, ma abụba kpuchiri eriri afọ ya ma abụba niile dị gburugburu eriri afọ ya, 9 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 10 Ọ bụ ihe ndị ahụ a na-ewepụta n’oké ehi e ji achụ àjà udo+ ka ọ ga-ewepụta. Onye nchụàjà ahụ ga-esu ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ.
-