-
Levitikọs 4:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ma akpụkpọ oké ehi ahụ, ya na anụ ya niile, isi ya, ụkwụ ya, eriri afọ ya, na nsị ya,+ 12 ya bụ, ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ, ka ọ ga-ahụ na e bupụrụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu ma buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-ekpofu ntụ.* Ọ ga-edokwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ Ọ bụ n’ebe a na-ekpofu ntụ ka a ga-akpọ ha ọkụ.
-