3 “‘Ọ bụrụ na ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, ọ ga-eweta oké ehi ahụ́ dị mma.+ Ọ ga-eji obi ya+ weta ya n’ihu Jehova, n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.
9 “Nye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iwu, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà a na-esu ọkụ:+ Anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ ga-adị n’ekwú ebe ịchụàjà abalị niile ruo ụtụtụ. A ga-emekwa ka ọkụ na-enwu n’ebe ịchụàjà.