2“‘Ọ bụrụ na mmadụ* chọrọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma. Ọ ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.+
11 “‘E nweghị àjà ọka unu ga-achụrụ Jehova a ga-etinye ihe na-eko achịcha,+ n’ihi na unu agaghị eji ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha ma ọ bụ mmanụ aṅụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ.