-
Levitikọs 3:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 “‘Ọ bụrụ na àjà ọ chọrọ ịchụ bụ àjà udo,+ ọ bụrụkwa na ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta anụ ọ ga-eji chụọ ya, ma ọ̀ bụ oké ma ọ̀ bụ nne, ọ bụ nke ahụ́ dị mma ka ọ ga-ewetara Jehova. 2 Ọ ga-ebikwasị aka ya n’isi anụ ahụ. A ga-egbukwa anụ ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà, ga-efesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.
-