-
Levitikọs 7:29-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla chọrọ ịchụrụ Jehova àjà udo ga-ewetara Jehova ụfọdụ n’ime anụ ọ ga-eji chụọ àjà udo ahụ.+ 30 Ọ ga-eji aka ya weta abụba+ anụ ahụ na okpuru afọ* ya ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova. Ọ ga-efegharị ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 31 Onye nchụàjà ga-esu abụba ahụ ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà,+ ma okpuru afọ* anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.+
-