-
Ọpụpụ 29:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ị ga-eme ka okpuru afọ* anụ ahụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị dị nsọ, ya na ụkwụ anụ ahụ bụ́ òkè dị nsọ e fegharịrị efegharị nke si n’ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ bụ́ nke a chụrụ n’àjà maka Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. 28 Ọ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ iwu ndị Izrel ga na-edebe mgbe niile, n’ihi na ọ bụ òkè dị nsọ. Ọ ga-abụ òkè dị nsọ ndị Izrel ga na-enye.+ Ọ bụ òkè dị nsọ ha ga-esi n’àjà udo ha na-enye Jehova.+
-