17 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwanne ya nwaanyị, ya bụ, nwa nwaanyị nna ya mụrụ ma ọ bụ nwa nwaanyị nne ya mụrụ, enwee mmekọahụ wee hụ ọtọ ibe ha, ọ bụ ihe ihere.+ A ga-egbu ha n’ihu ndị Izrel. Nwoke ahụ emenyela nwanne ya nwaanyị ihere. Ọ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.