6 Onye nchụàjà ga-ewere osisi sida, ahịhịa hisop,+ na ákwà na-acha uhie uhie ma tụba ha n’ọkụ ahụ na-ere nne ehi ahụ. 7 Onye nchụàjà ga-ejizi mmiri sụọ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. E mechaa, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ma onye nchụàjà ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.