Ọnụ Ọgụgụ 34:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Ọ bụ ala a ka unu ga-efe nza kee ka ọ bụrụ nke unu,+ otú Jehova nyere n’iwu ka e keere ebo itoolu na ọkara. Joshụa 14:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 E fere nza keere ebo itoolu na ọkara ala ahụ,+ otú Jehova gwara Mosis ka e mee.+ Joshụa 17:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Ha wee bịakwute Elieza+ onye nchụàjà na Joshụa nwa Nọn na ndị isi, sị: “Jehova gwara Mosis ka o nye anyị ala n’ebe ụmụnne anyị ndị nwoke ketara ala.”+ N’ihi ya, e nyere ha ala ebe ụmụnne nna ha ketara ala, otú Jehova kwuru ka e mee.+ Joshụa 18:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 Seenụ otú a ga-esi kee ala ahụ ụzọ asaa n’akwụkwọ. Wetakwaranụ m akwụkwọ ahụ ebe a. M ga-efekwara unu nza+ ebe a n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị. Ilu 16:33 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 33 Mmadụ na-efe nza,*+Ma ọ bụ Jehova na-ekpebi ihe niile a na-efeta na nza.+
13 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Ọ bụ ala a ka unu ga-efe nza kee ka ọ bụrụ nke unu,+ otú Jehova nyere n’iwu ka e keere ebo itoolu na ọkara.
4 Ha wee bịakwute Elieza+ onye nchụàjà na Joshụa nwa Nọn na ndị isi, sị: “Jehova gwara Mosis ka o nye anyị ala n’ebe ụmụnne anyị ndị nwoke ketara ala.”+ N’ihi ya, e nyere ha ala ebe ụmụnne nna ha ketara ala, otú Jehova kwuru ka e mee.+
6 Seenụ otú a ga-esi kee ala ahụ ụzọ asaa n’akwụkwọ. Wetakwaranụ m akwụkwọ ahụ ebe a. M ga-efekwara unu nza+ ebe a n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị.